Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 6
  • E Jiri Obiọma Mesoo Ndị Ụkọchukwu Iwe Ji Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Jiri Obiọma Mesoo Ndị Ụkọchukwu Iwe Ji Ihe
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Chọtara Udo n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Uru Iji Ihe Nkwagharị Ezi Ozi Ọma Na-aba n’Ụwa Niile
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Olee Ebe Unu Nọ Kemgbe?
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2017
  • O Meghị Agadi Gabiga Ókè Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 6
Ebe onye ụkọchukwu gbaturu ihe e ji akwagharị akwụkwọ ma tụkasịa akwụkwọ dị na ya ka Ndịàmà Jehova bu ihe ahụ nọ nwayọọ na-ele ya

E Jiri Obiọma Mesoo Ndị Ụkọchukwu Iwe Ji Ihe

Artur, bụ́ onye nlekọta sekit nọ n’Aminia, nọ na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ chọpụtara na ha anaghị ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, bụ́ nke a na-ejikarị ihe a na-akwagharị akwagharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl dị na ya eme. Iji gbaa ha ume ka ha mewe ya, Artur na nwunye ya, Anna, na otu Onyeàmà ọzọ aha ya bụ Jirayr, buuru ihe a na-akwagharị akwagharị gaa ikwusa ozi ọma n’otu obere obodo. Ha gara n’ebe ndị ji ụkwụ na-esikarị agafe.

O gbughị oge, ndị na-agafe ebe ahụ egosiwa mmasị n’akwụkwọ ndị ha dowere ebe ahụ. Ma, n’oge na-adịghịkwa anya, ndị mmegide bịara. Ndị ụkọchukwu abụọ bịara ebe ahụ, otu n’ime ha agbaa ihe ahụ e ji tinye akwụkwọ ụkwụ ya adaa. Ya amazie Artur aka ntị, enyo anya ya adapụ. Artur, Anna, na Jirayr gbalịrị ka ha jie ndị ụkọchukwu ahụ, ma o nweghị isi. Ndị ụkọchukwu ahụ zọrọ ihe ahụ ụkwụ, mebisịa akwụkwọ ndị dị na ya. Mgbe ha kpọchara Ndịàmà ndị ahụ iyi, gwakwa ha na ha ga-emesi ha ike, ha pụrụ.

Artur, Anna, na Jirayr gara n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị ebe ahụ gaa kọọrọ ha ihe merenụ. Mgbe ha kọchaara ha ihe merenụ, ha zitụrụ ụfọdụ ndị uwe ojii na ndị ọzọ nọ ebe ahụ ozi ọma. A kpọgaziri ha atọ n’ọfịs onyeisi ndị uwe ojii. Ná mmalite, ihe ọ chọrọ bụ naanị ịma ihe merenụ. Ma mgbe ọ nụrụ na Artur, onye gbara ezigbo dimkpa, alụsịghị ndị ụkọchukwu ahụ ọgụ mgbe a mara ya aka ntị, ọ kwụsịrị ịjụ ha ajụjụ gbasara ihe ahụ merenụ. Ọ maliteziri ịjụ ha gbasara ihe Ndịàmà Jehova kweere. Ha na onye uwe ojii ahụ kpawaziri nkata ruo awa anọ. Ihe onye uwe ojii ahụ mụtara masịrị ya nke mere o ji kwuo, sị: “Chọọchị unu amaka. Achọrọ m isonyere unu.”

Artur na Anna gaghachiri n’ebe ha nọ na-ekwusa ozi ọma

Artur na Anna

N’echi ya, mgbe Artur gaghachiri ebe ahụ ha nọ na-ekwusa ozi ọma, otu nwoke hụrụ ihe ahụ merenụ bịakwutere ya. O kelere Artur maka otú o si kpaa àgwà ma ghara imegwara ihe e mere ya. O kwukwara na ihe ahụ merenụ mere ka ọ gharazie ịna-akwanyere ndị ụkọchukwu ùgwù.

Ná mgbede, onyeisi ndị uwe ojii ahụ kpọrọ Artur ka ọ bịaghachi n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Kama ịjụwa ya gbasara ihe ahụ merenụ, ọ malitere jụwa ya gbasara ihe ndị Baịbụl kwuru. Ndị uwe ojii abụọ ọzọ sonyeere ha ná mkparịta ụka ahụ.

N’ụbọchị na-eso ya, Artur gara na nke onye isi ndị uwe ojii ahụ ọzọ. Na nke ugbu a, o gosiri ya ụfọdụ vidio anyị ndị kwuru gbasara ihe ndị dị na Baịbụl. Onye isi ndị uwe ojii ahụ kpọrọ ndị uwe ojii ndị ọzọ ka ha soro lee vidio ndị ahụ.

N’ihi ihe ahụ ndị ụkọchukwu ahụ mere, e ziri ọtụtụ ndị uwe ojii ozi ọma. Ihe a bụ nke mbụ ọtụtụ n’ime ha na-anụ ozi ọma. Nke a meziri ka ha na-elezi Ndịàmà Jehova anya ọma.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya