OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ịhụnanya Ka E Ji Amata Ezigbo Ndị Kraịst—Mee Ka Ọgbakọ Na-adị n’Otu
IHE MERE O JI DỊ MKPA: N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya “dị n’otu n’ụzọ zuru okè.” (Jọn 17:23.) Iji nọgide na-adị n’otu, anyị kwesịrị inwe ụdị ịhụnanya ahụ ‘na-adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’—1 Kọr. 13:5.
OTÚ I GA-ESI EME YA:
Na-elekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma otú ahụ Jehova na-eme
Na-agbaghara kpamkpam
Gị na mmadụ dozichaa esemokwu unu, echetala ya ọzọ.—Ilu 17:9
LEENỤ VIDIO BỤ́ ‘NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU’—AGỤKỌLA MMEJỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Ná mbido vidio a, olee otú Helen si gosi na ya ‘na-agụkọ ihe ọjọọ’ e mere ya?
Oleezi otú Helen si wepụ echiche ọjọọ ya, ma lewezie ihe anya otú dị mma?
N’ikpeazụ, gịnị ka Helen mere iji mee ka ọgbakọ nọgide na-adị n’otu?
Ònye ka ọ ga-akacha akpatara nsogbu ma anyị na-agụkọ ihe ọjọọ e mere anyị?