Job
9 Job wee zaa, sị:
2 “N’ezie, a maara m na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị.
Ma olee otú mmadụ efu ga-esi bụrụ onye ziri ezi ma ya na Chineke nwee okwu ikpe?+
7 Ọ na-agwa anyanwụ ka ọ ghara ịcha,
Ọ na-ekpuchikwa kpakpando ka a ghara ịhụ ha,+
Na-ejekwa ije n’elu oké ebili mmiri nke oké osimiri;+
9 O mere ìgwè kpakpando bụ́ Ash, ìgwè kpakpando bụ́ Kisịl,
Tinyere ìgwè kpakpando bụ́ Kaịma+ nakwa ọnụ ụlọ ndị dị n’ime, n’ebe Ndịda;
10 Ọ na-eme oké ihe ndị a na-apụghị ịchọpụtacha achọpụtacha,+
Na ihe dị ebube a na-apụghị ịgụta ọnụ.+
15 Bụ́ onye m na-agaghị asa okwu, a sịgodị na m bụ onye ziri ezi.+
M ga-arịọ onye mụ na ya nwere ikpe arịrịọ.+
16 Ọ bụrụ na mụ akpọọ ya, ọ̀ ga-aza m?+
Ekwetaghị m na ọ ga-ege ntị n’olu m;
17 Bụ́ onye ji oké ifufe mmiri na-emerụsị m ahụ́,
Na-emekwa ka ọnyá m dị ọtụtụ n’enweghị ihe m mere.+
19 Ọ bụrụ na e nwere onye dị ike, ọ bụ ya;+
Ọ bụrụkwa na e nwere onye dị ike, nke na-ekpekwa ikpe ziri ezi, ọ ga-adị m mma ma ọ kpọọ m!
20 Ọ bụrụ na m bụ onye ziri ezi, ọnụ m ga-akpọ m onye ajọ omume;
A si na mụ enweghị ihe a ga-eji taa m ụta, ọ ga-akpọ m onye aghụghọ.
21 A sị na mụ enweghị ihe a ga-eji taa m ụta, agaghị m ama mkpụrụ obi m;
M ga-akpọ ndụ m asị.
22 E nwere otu ihe. Ọ bụ ya mere m ji asị,
‘Ọ na-ala ma onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ma onye ajọ omume n’iyi.’+
23 Ọ bụrụ na oké idei mmiri akpata ọnwụ mberede,
Ọ ga-akwa obi nkoropụ nke ndị aka ha dị ọcha emo.
25 Ụbọchị niile nke ndụ m efewokwa ọsọ karịa onye na-agba ọsọ;+
Ha agbaferewo, ọ dịghị ihe ọma ha ga-ahụ.
26 Ha agafewo dị ka ụgbọ epeepe e ji ahịhịa amị rụọ,
Dị ka ugo nke na-efegharị na-achọ ihe ọ ga-eri.+
30 Ọ bụrụ na mụ asaa ahụ́ ná mmiri snoo,
Jirikwa ncha+ kwọọ aka m,
31 N’ime olulu ka ị ga-asụnye m,
Uwe m ga-akpọkwa m asị.
32 N’ihi na ọ bụghị mmadụ+ dị ka mụ onwe m nke na m ga-asa ya okwu,
Nke na anyị ga-ezukọ ka e kpeere anyị ikpe.
35 Ka m kwuo okwu n’atụghị ya egwu,
N’ihi na adịghị m eme otú ahụ.