Jenesis 40:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 N’ihi na, n’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru+ tọrọ m; n’ebe a kwa, ọ dịghị ihe ọ bụla m mere nke mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”+ Jenesis 45:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Josef wee gwa ụmụnne ya, sị: “Biko, bịanụ m nso.” Ha wee bịa ya nso. O wee sị: “Abụ m Josef nwanne unu, onye unu refuru n’Ijipt.+ Diuterọnọmi 24:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Ọ bụrụ na a hụ mmadụ ka ọ na-atọrọ+ mkpụrụ obi otu n’ime ụmụnne ya n’etiti ụmụ Izrel, ọ bụrụkwa na o mesowo ya ihe n’aka ike wee ree ya,+ onye ahụ nke tọọrọ mmadụ ga-anwụ. Ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+ Abụ Ọma 105:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 O zipụrụ otu nwoke ka o buru ha ụzọ gawa,Ya bụ, Josef, onye e rere ka ọ bụrụ ohu.+
15 N’ihi na, n’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru+ tọrọ m; n’ebe a kwa, ọ dịghị ihe ọ bụla m mere nke mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”+
4 Josef wee gwa ụmụnne ya, sị: “Biko, bịanụ m nso.” Ha wee bịa ya nso. O wee sị: “Abụ m Josef nwanne unu, onye unu refuru n’Ijipt.+
7 “Ọ bụrụ na a hụ mmadụ ka ọ na-atọrọ+ mkpụrụ obi otu n’ime ụmụnne ya n’etiti ụmụ Izrel, ọ bụrụkwa na o mesowo ya ihe n’aka ike wee ree ya,+ onye ahụ nke tọọrọ mmadụ ga-anwụ. Ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+