Jenesis
40 O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na obu ihe ọṅụṅụ+ eze Ijipt na onye na-emere ya achịcha mehiere onyenwe ha bụ́ eze Ijipt.+ 2 Fero wee weso mmadụ abụọ ahụ na-ejere ya ozi iwe,+ ya bụ, onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-eme achịcha.+ 3 O wee tụba ha n’ụlọ nga nke ụlọ onyeisi ndị nche,+ n’ụlọ mkpọrọ,+ bụ́ ebe Josef bụ onye mkpọrọ. 4 Onyeisi ndị nche wee mee ka ha na Josef na-anọ ka o wee na-ejere ha ozi;+ ha wee nọrọ n’ụlọ nga ruo ụbọchị ụfọdụ.
5 Ha abụọ wee rọọ nrọ,+ onye nke ọ bụla rọrọ nrọ nke ya n’otu abalị ahụ,+ nrọ onye nke ọ bụla nwere nkọwa nke ya,+ obu ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-emere ya achịcha, bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ.+ 6 Mgbe Josef bịakwutere ha n’ụtụtụ wee hụ ha, lee, ihu ha gbarụrụ agbarụ.+ 7 O wee malite ịjụ ndị ahụ na-ejere Fero ozi, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ụlọ nga nke ụlọ nna ya ukwu, sị: “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”+ 8 Ha wee sị ya: “Anyị rọrọ nrọ, ọ dịghịkwa ọkọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef wee sị ha: “Ọ́ bụghị Chineke nwe ịkọwa ihe?+ Biko, kọọrọnụ m ya.”
9 Onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ wee kọọrọ Josef nrọ ya wee sị ya: “Ná nrọ m, lee, e nwere osisi vaịn dị n’ihu m. 10 Osisi vaịn ahụ nwere alaka atọ, o yikwara ka ọ na-epupụta akwụkwọ ọhụrụ.+ O wee maa ifuru. Mkpụrụ ya wee chaa n’ụyọkọ ha. 11 Eji m iko Fero n’aka, m wee were mkpụrụ vaịn ndị ahụ pịnye ha n’iko Fero.+ E mesịa, m bunyere Fero iko ahụ.”+ 12 Josef wee sị ya: “Nke a bụ nkọwa ya:+ Alaka atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 13 Abalị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị, ọ ga-akpọghachikwa gị n’ọrụ gị;+ ị ga na-ebunyekwa Fero iko dị ka ị na-emebu mgbe ị rụrụ ọrụ dị ka obu ihe ọṅụṅụ ya.+ 14 Otú o sina dị, chetakwa m ozugbo ihe gaziiri gị,+ biko, gosikwa m obiọma* ma kọọrọ Fero banyere m,+ meekwa ka m si n’ụlọ a pụta. 15 N’ihi na, n’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru+ tọrọ m; n’ebe a kwa, ọ dịghị ihe ọ bụla m mere nke mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”+
16 Mgbe onyeisi ndị na-eme achịcha hụrụ na ihe ọ kọwara dị mma, ya onwe ya gwara Josef, sị: “Mụ onwe m kwa nọ ná nrọ, lee, ebu m nkata atọ n’isi bụ́ ndị achịcha ọcha dị n’ime ha, 17 n’ime nkata nke dị n’elu elu, e nwere ụdị ihe oriri niile Fero na-eri,+ bụ́ ndị onye na-eme achịcha mere, anụ ufe+ nọkwa na-eri ha n’ime nkata ahụ m bu n’isi.” 18 Josef wee zaa, sị: “Nke a bụ nkọwa ya:+ Nkata atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 19 Abalị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị ma gbupụ gị isi, ọ ga-akwụwa gị n’osisi;+ anụ ufe ga-erikwa anụ gị.”+
20 Ụbọchị nke atọ wee bụrụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Fero,+ o wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri ma kpọpụta onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ, kpọpụtakwa onyeisi ndị na-eme achịcha n’etiti ndị na-ejere ya ozi.+ 21 O wee nyeghachi onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ ọrụ ya dị ka obu ihe ọṅụṅụ,+ o wee na-ebunye Fero iko. 22 Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-eme achịcha n’osisi,+ dị nnọọ ka Josef kọwaara ha.+ 23 Otú ọ dị, onyeisi ndị obu ihe ọṅụṅụ ahụ echetaghị Josef, o chefuru ya.+