10 Otú ọ dị, Rizpa ada Eya+ chịịrị ákwà iru uju+ gbasaara ya onwe ya n’elu oké nkume malite ná mbido owuwe ihe ubi ruo mgbe mmiri si n’eluigwe zokwasị ha;+ o kweghịkwa ka anụ ufe+ bekwasị ha n’ehihie ma ọ bụ ka anụ ọhịa+ bịa n’ebe ha nọ n’abalị.
4 ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị,+ a gaghịkwa eli ha eli.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala;+ mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi,+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.’+
4 N’ugwu ndị dị n’Izrel ka ị ga-ada,+ gị na ìgwè ndị agha gị niile na ndị ga-eso gị. M ga-ewere gị nye nnụnụ na-eri anụ, ụdị nnụnụ ọ bụla, na anụ ọhịa ka ị bụrụ nri ha.”+
17 Ahụkwara m otu mmụọ ozi ka o guzo n’anyanwụ, o wee jiri oké olu kpọọ nnụnụ niile+ na-efe n’etiti eluigwe, sị: “Bịanụ ebe a, zukọtanụ iri oké nri anyasị nke Chineke,