18 Juda wee bịaruo ya nso wee sị: “Nna m ukwu, m na-arịọ gị arịrịọ, biko, ka ohu gị kwuo okwu ná ntị nna m ukwu,+ ka ị gharakwa iweso ohu gị iwe dị ọkụ,+ n’ihi na gị na Fero bụ otu ihe.+
8 Ya mere, ọ bụghị unu zitere m n’ebe a,+ kama ọ bụ ezi Chineke, ka o wee mee ka m bụụrụ Fero nna,+ bụrụkwa onye nwe ụlọ ya dum nakwa onye na-achị ala Ijipt dum.
10 Ọ napụtakwara ya ná mkpagbu ya niile, meekwa ka o nweta amara na amamihe n’ihu Fero bụ́ eze Ijipt. Fero mere ya onye na-achị Ijipt nakwa ụlọ ya dum.+