6 Mozis wee zipụ ha, otu puku mmadụ site n’ebo nke ọ bụla, ha na Finihas+ nwa Elieza bụ́ onye nchụàjà, ka ha soro ná ndị agha, o jikwa arịa dị nsọ na opi+ ndị ahụ e ji akpọ òkù.
31 Finihas nwa Elieza onye nchụàjà wee gwa ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ụmụ Manase, sị: “Anyị amatawo taa na Jehova nọ n’etiti anyị,+ n’ihi na unu emesoghị Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi a. Ugbu a, unu anapụtawo ụmụ Izrel n’aka Jehova.”+
28 Finihas+ nwa Elieza, nwa Erọn, guzo n’ihu ya n’oge ahụ,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa ọzọ buso ụmụ Benjamin nwanne m agha ka ọ̀ bụ mụ agala?”+ Jehova wee sị ya: “Gaa, n’ihi na echi ka m ga-enyefe ya n’aka gị.”+