3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+
15 I nyekwara ha achịcha nke si n’eluigwe n’ihi agụụ nke na-agụ ha,+ i mekwara ka mmiri si na nkume dị elu gbapụtara ha n’ihi akpịrị nke na-akpọ ha nkụ,+ i wee gwa ha ka ha banye+ ma nweta ala ahụ i weliri aka gị ṅụọ iyi na ị ga-enye ha.+