17 O wee mee ka eze ndị Kaldia buso ha agha,+ eze ahụ wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ime ụlọ nsọ ha,+ o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko.+ O nyefere ihe niile n’aka ya.
3 M wee sị eze: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!+ Gịnị mere ihu m agaghị agbarụ agbarụ mgbe obodo m,+ ụlọ ebe e liri nna nna m hà,+ bụ ebe e bibiri ebibi, ọkụ erepịawokwa ọnụ ụzọ ámá ya niile?”+
7 Ala unu bụ ebe tọgbọrọ n’efu,+ a gbawo obodo unu niile ọkụ;+ ndị ala ọzọ+ eripịawo+ ala unu n’anya unu, ọ tọgbọrọ n’efu dị ka obodo ndị ala ọzọ kwaturu.+
7 Ọ pụtawo dị ka ọdụm nke si n’obere ọhịa ọ nọ pụta,+ onye ahụ nke na-ebibi mba dị iche iche amalitewo njem;+ o siwo n’obodo ya bilie ka o mee ka ala gị bụrụ ihe ijuanya. Obodo gị niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe nke na ọ dịghị onye ga-ebi na ha.+