17 Ọ ga-esi n’etiti nku ya abụọ nyawaa ya. Ọ gaghị anyakapụ ya anyakapụ.+ Mgbe ahụ, onye nchụàjà ga-esure ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, n’elu nkụ dị n’ọkụ. Ọ bụ àjà nsure ọkụ,+ àjà na-esi ísì ụtọ nke a na-esurere Jehova n’ọkụ.+
31 Ọ ga-ewepụta abụba ya niile,+ dị ka e wepụtara n’anụ àjà udo ahụ;+ onye nchụàjà ga-esure ya n’ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Jehova;+ onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya, a ga-agbaghara ya.+
2 na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.