11 Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+
16 O wee daba na ka anyị nọ na-eje n’ebe a na-ekpe ekpere, otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye nwere otu mmụọ,+ bụ́ mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,+ zutere anyị. Ọ na-ewetara ndị nna ya ukwu uru dị ukwuu+ site n’ịkọ ọdịnihu.
10 N’ihi na ịhụ ego n’anya+ bụ mgbọrọgwụ+ nke ụdị ihe ọjọọ niile.+ Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.+