64 Ma ọ dịghị nwoke ọ bụla n’ime ndị ahụ Mozis na Erọn onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ mgbe ha debara aha ụmụ Izrel n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị+ so ná ndị a.
14 Oge anyị jere ije malite na Kedesh-bania ruo mgbe anyị gafere iyi ndagwurugwu Zired dị afọ iri atọ na asatọ, ruo mgbe ọgbọ ahụ dum bụ́ ndị ikom na-aga agha nwụchara n’etiti ndị Izrel, dị nnọọ ka Jehova ṅụụrụ ha iyi.+