11 otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+
28 Ndị gbanahụrụ mma agha ga-esi n’ala Ijipt laghachi n’ala Juda, ha ga-adị ole na ole;+ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ́ ndị na-abata n’ala Ijipt ka ha biri n’ime ya dị ka ndị ọbịa, ga-amata onye okwu ya ga-emezu, ihe m kwuru ka ọ̀ bụ ihe ha kwuru.”’”+
18 ka anyị, bụ́ ndị gbagaworo n’ebe mgbaba ahụ wee nwee agbamume siri ike iji jigide olileanya ahụ+ e debere n’ihu anyị, site n’ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha na ha.+