34 Onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu ga-adịrị unu ka nwa afọ; unu ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe unu,+ n’ihi na unu ghọrọ ndị mbịarambịa n’ala Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nakwa onye ọ bụla n’ime ndị mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke nyere Molek nwa ya ọ bụla,+ a ghaghị igbu ya. Ndị ala unu ga-eji nkume tụgbuo ya.
16 Ya mere, a ghaghị igbu onye kwuluru aha Jehova.+ Nzukọ ahụ dum aghaghị ịtụ ya nkume. A ga-egbu ma onye mbịarambịa ma nwa afọ n’ihi ikwulu aha Chineke.+