5 N’afọ nke iri na anọ, Kedọlaoma bịara, ya na ndị eze so ya, ha wee merie ndị Refeyim n’Ashterọt-kaneyim,+ nọrọ na Ham merie ndị Zuzim, nọrọkwa na Sheve-kiriateyim merie ndị Imim,+
11 N’ihi na ọ bụ naanị Ọg eze Beshan fọdụrụ ndụ n’ime ndị Refeyim fọdụrụnụ.+ Lee! E ji ígwè rụọ ihe o ji ebu ozu. Ọ́ bụghị na Raba+ nke ụmụ Amọn ka ọ dị? Ọ dị kubit itoolu n’ogologo, dịrịkwa kubit anọ n’obosara, ma e jiri kubit nkịtị tụọ ya.
6 Agha wee daa ọzọ na Gat,+ mgbe e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa+ bụ́ onye mkpịsị aka ya na mkpịsị ụkwụ ya dị isii isii, ya bụ, iri abụọ na anọ;+ ya onwe ya kwa bụ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+