1 Ihe E Mere
20 O wee ruo ná mmalite afọ,+ n’oge ndị eze na-eji aga agha,+ na Joab duuru ìgwè ndị agha+ gaa bibie ala ụmụ Amọn, bịakwa nọchibido Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem; Joab wee merie+ Raba, kwadakwa ya. 2 Ma Devid kpupụrụ Malkam okpueze dị ya n’isi+ wee hụ na ọ dị otu talent ọlaedo n’ịdị arọ, e nwekwara nkume dị oké ọnụ ahịa na ya; Devid wee kpuru ya. Ihe ndị a kwatara n’obodo ahụ, bụ́ ndị o bupụtara, dị nnọọ ukwuu.+ 3 O wee kpọpụta ndị bi n’ime ya wee nye ha ọrụ+ ịwa nkume nakwa iji ngwá ọrụ na-aghọ nkọ ndị e ji ígwè mee na anyụike na-arụ ọrụ;+ ọ bụkwa otú ahụ ka Devid mere obodo niile nke ụmụ Amọn. N’ikpeazụ, Devid na ndị niile ya na ha so laghachiri Jeruselem.
4 O wee ruo mgbe nke a gasịrị na agha daara ha na ndị Filistia+ n’ime Giza.+ Ọ bụ mgbe ahụ ka Sibekaị+ onye Husha gburu Sipaị, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim,+ e wee merie ha.
5 Agha wee daara ha na ndị Filistia ọzọ; Elhenan+ nwa Jeya wee gbuo Lamaị nwanne Golayat+ onye Gat, bụ́ onye okporo ube ya dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà.+
6 Agha wee daa ọzọ na Gat,+ mgbe e nwere otu nwoke gbara ajọ dimkpa+ bụ́ onye mkpịsị aka ya na mkpịsị ụkwụ ya dị isii isii, ya bụ, iri abụọ na anọ;+ ya onwe ya kwa bụ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim.+ 7 O wee na-akwa Izrel emo.+ N’ikpeazụ, Jọnatan nwa Shimia+ bụ́ nwanne Devid gburu ya.
8 Ọ bụ ndị a ka a mụụrụ ndị Refeyim+ bi na Gat;+ Devid na ndị na-ejere ya ozi gbukwara ha.+