1 Ihe E Mere
19 O wee ruo mgbe e mesịrị na Nehash+ eze ụmụ Amọn nwụrụ, nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+ 2 Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash obiọma*+ n’ihi na nna ya gosiri m obiọma.”+ Devid wee ziga ndị ozi ka ha kasie ya obi maka nna ya. Ndị na-ejere Devid ozi wee bata n’ala ụmụ Amọn+ wee gakwuru Henọn ịkasi ya obi. 3 Otú ọ dị, ndị isi ụmụ Amọn sịrị Henọn: “N’anya gị, ọ̀ bụ ùgwù ka Devid na-akwanyere nna gị mere o ji zitere gị ndị nkasi obi? Ọ́ bụghị ka ha mee nchọpụta nke ọma banyere ala a na ịkwatu ya na iledo+ ya mere ndị na-ejere ya ozi ji bịakwute gị?”+ 4 Henọn wee kpọrọ ndị na-ejere Devid ozi+ kpụchaa ha ajị+ ma chawaa uwe mwụda ha ruo n’ikè+ wee hapụ ha ka ha laa.+ 5 E mesịa, ndị mmadụ gara kọọrọ Devid banyere ndị ikom ahụ; o wee zipụ ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa zute ha, n’ihi na e menyewo ha ihere nke ukwuu; eze wee sị ha: “Nọrọnụ na Jeriko+ ruo mgbe ajị agba unu rujuru. Mgbe ahụ, unu ga-alọta.”
6 Ka oge na-aga, ụmụ Amọn hụrụ na ha na-esizi ísì ọjọọ+ n’ebe Devid nọ, Henọn+ na ụmụ Amọn wee ziga otu puku talent ọlaọcha+ iji si na Mesopotemia na Eram-meaka+ nakwa Zoba+ gbazite ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ịnyịnya. 7 Ha wee gbazite puku ụgbọ ịnyịnya iri atọ na abụọ+ ma goo eze Meaka na ndị ya ọrụ.+ Ha wee bata maa ụlọikwuu n’ihu Medeba;+ ma ụmụ Amọn si n’obodo ha zukọta wee bịa ibu agha.
8 Mgbe Devid nụrụ ya, o zipụrụ Joab+ na ndị agha niile na ndị dike ozugbo.+ 9 Ụmụ Amọn wee malite ịpụta na ịhazi onwe ha n’usoro iji buo agha n’ọnụ ụzọ obodo ahụ, ma ndị eze+ bịaranụ nọ naanị ha n’ọhịa.
10 Mgbe Joab hụrụ na e si n’ihu, sikwa n’azụ na-abịa ibuso ya agha, ozugbo, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị niile kasị ike n’Izrel wee hazie ha n’usoro izute ndị Siria.+ 11 Ma ọ kpọnyere Abishaị+ nwanne ya ndị fọdụrụnụ, ka ha wee hazie onwe ha n’usoro izute ụmụ Amọn.+ 12 O wee sị: “Ọ bụrụ na ndị Siria+ akarịa m ike, ị ga-abụrụ m onye nzọpụta;+ ma ọ bụrụ na ụmụ Amọn akarịa gị ike, m ga-azọpụta gị.+ 13 Dị ike,+ ka anyị nweekwa obi ike n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị;+ Jehova ga-emekwa ihe dị mma n’anya ya.”+
14 Joab na ndị ya na ha so wee garukwuo ndị Siria nso ibuso ha agha,+ ha wee si n’ihu ya gbaa ọsọ.+ 15 Ma ụmụ Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, ha onwe ha kwa wee si n’ihu Abishaị nwanne ya gbaa ọsọ+ wee gbaba n’obodo.+ E mesịa, Joab batara na Jeruselem.
16 Mgbe ndị Siria hụrụ na Izrel emeriwo ha,+ ha zigara ndị ozi wee kpọpụta ndị Siria nọ n’ógbè Osimiri Yufretis,+ Shofak, bụ́ onyeisi ndị agha Hadadiza, dukwa ha.
17 Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara Izrel dum ozugbo gafee Jọdan wee bịakwute ha ma hazie onwe ha n’usoro ibuso ha agha.+ Mgbe Devid pụtara ibuso ndị Siria agha, ha malitere ibuso ya agha. 18 Ma ndị Siria gbara ọsọ+ n’ihi ndị Izrel; Devid wee gbuo n’ime ndị Siria puku mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya na puku ndị ikom iri anọ bụ́ ndị ji ụkwụ aga. O gbukwara Shofak bụ́ onyeisi ndị agha ha.+ 19 Mgbe ndị na-ejere Hadadiza ozi hụrụ na Izrel emeriwo ha,+ ngwa ngwa ha mere ka ha na Devid dị n’udo wee malite ijere ya ozi;+ Siria achọghịkwa ịnwa ọzọ ịzọpụta ụmụ Amọn.+