1 Ihe E Mere
18 O wee ruo mgbe e mesịrị na Devid meriri ndị Filistia+ wee mee ka ha nọrọ n’okpuru ya ma nara ndị Filistia Gat+ na obodo nta ya dị iche iche. 2 O wee merie Moab,+ ndị Moab wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi, na-atụrụ ya ụtụ.+
3 Devid wee gbuo Hadadiza+ bụ́ eze Zoba+ n’ime Hemat+ ka ọ na-aga inweta osimiri Yufretis.+ 4 Devid nakwaara ya puku ụgbọ ịnyịnya asaa, jidekwa puku mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya nakwa puku ndị ikom iri abụọ ndị ji ụkwụ aga.+ Devid wee see+ ịnyịnya niile na-adọkpụ ụgbọala akwara,+ ma ọ hapụrụ otu narị ịnyịnya na-adọkpụ ụgbọala. 5 Mgbe Siria nke Damaskọs bịara inyere Hadadiza bụ́ eze Zoba aka,+ Devid gburu puku mmadụ iri abụọ na abụọ n’ime ndị Siria. 6 E mesịa, Devid debegasịrị ndị agha na-eche nche na Siria nke Damaskọs.+ Ndị Siria wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi, na-atụrụ ya ụtụ.+ Jehova wee na-azọpụta Devid ebe ọ bụla ọ gara.+ 7 Devid bukọkwaara ọta ọlaedo dị okirikiri+ ndị na-ejere Hadadiza ozi bu wee bute ha na Jeruselem.+ 8 Devid sikwa na Tibhat+ na Kọn, bụ́ obodo Hadadiza, buru ọla kọpa dị nnọọ ukwuu. Sọlọmọn ji ha rụọ oké osimiri ọla kọpa+ na ogidi+ nakwa arịa ndị e ji ọla kọpa mee.+
9 Mgbe Tou eze Hemat+ nụrụ na Devid egbuwo ndị agha niile nke Hadadiza+ bụ́ eze Zoba, 10 o zipụrụ Hedoram+ nwa ya ozugbo ka ọ gakwuru Eze Devid jụọ ya otú o mere ma jaa ya ike maka na o busoro Hadadiza agha wee gbuo ya, (n’ihi na e nyere Hadadiza ọzụzụ ibuso Tou agha,) o bukwa ụdị ihe niile e ji ọlaedo na ọlaọcha+ na ọla kọpa mee. 11 Eze Devid dokwara ihe ndị a nsọ+ nye Jehova, tinyere ọlaọcha na ọlaedo o si ná mba dị iche iche bute,+ ya bụ, site n’Idọm na Moab+ nakwa site n’aka ụmụ Amọn+ na ndị Filistia+ na Amalek.+
12 Ma Abishaị+ nwa Zeruya+ gburu ndị Idọm na Ndagwurugwu Nnu,+ puku mmadụ iri na asatọ. 13 O wee debegasịa ndị agha na-eche nche n’Idọm, ndị Idọm niile wee ghọọ ndị na-ejere Devid ozi.+ Jehova wee na-azọpụta Devid n’ebe ọ bụla ọ gara.+ 14 Devid wee na-achị Izrel dum+, ọ nọkwa na-ekpere ndị ya niile ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ziri ezi.+ 15 Joab nwa Zeruya bụ onyeisi ndị agha,+ Jehọshafat+ nwa Ahaịlọd bụkwa onye na-edekọ ihe. 16 Zedọk+ nwa Ahaịtọb na Ahimelek+ nwa Abayata bụ ndị nchụàjà, Shavsha+ bụkwa odeakwụkwọ. 17 Benaya+ nwa Jehoyada+ bụ onyeisi ndị Keretaịt+ na ndị Peletaịt;+ ụmụ Devid nọkwa n’ọkwá kasị elu n’akụkụ eze.+