10 Hụ na i nyere ya ihe,+ enwela mwute n’obi gị mgbe ị na-enye ya ihe, n’ihi na ọ bụ nke a ga-eme ka Jehova bụ́ Chineke gị gọzie gị n’ihe ọ bụla ị na-eme nakwa n’ihe ọ bụla ị na-arụ.+
38 Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.+ Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”+
17 Ma onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa a nke e ji ebi ndụ+ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa,+ ma o nweghị ọmịiko n’ebe ọ nọ,+ olee otú ịhụnanya maka Chineke si dịrị n’ime ya?+