16 mụ onwe m ga-eme unu ihe ndị a, iji nye unu ntaramahụhụ, m ga-eme ka ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ mee ka ha maa jijiji, bụ́ ndị ga-eme ka unu ghara ịhụkwa ụzọ,+ meekwa ka ike gwụ mkpụrụ obi unu.+ Unu ga-aghakwa mkpụrụ unu n’efu, ebe ndị iro unu ga-erichapụ ya.+