25 Tụfịakwa! Ị gaghị eme otú a, igbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, nke na ihe ga-eme onye ajọ omume ga-emekwa onye ezi omume.+ Tụfịakwa! Ị gaghị eme ya.+ Ọ̀ bụ na Onyeikpe nke ụwa dum agaghị eme ihe ziri ezi?”+
9 Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe ndị a?+ Ònye nwere uche, ka o wee mara ha?+ N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi,+ ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya;+ ma ndị na-emebi iwu ga-asụ ngọngọ na ya.+