-
2 Ihe E Mere 28:15Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
15 Ndị a kpọrọ aha+ wee bilie kpọrọ ndị ahụ a dọtara n’agha, ha sikwa n’ihe ndị ahụ a kwatara akwata chịnye ndị gba ọtọ n’ime ha uwe ka ha yiri. Ha wee chịnye ha uwe ka ha yiri,+ chịnyekwa ha akpụkpọ ụkwụ, nye ha ihe oriri,+ nyekwa ha ihe ọṅụṅụ,+ teekwa ha mmanụ. Ha jikwa ịnyịnya ibu buru+ ndị ike gwụrụ ịga ije wee bute ha Jeriko,+ bụ́ obodo nkwụ,+ n’ebe ụmụnne ha nọ. E mesịa, ha laghachiri Sameria.+
-