9 Ọ ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama n’aka gị nakwa ihe ncheta n’agbata anya gị abụọ,+ ka iwu Jehova wee dịrị n’ọnụ gị;+ n’ihi na Jehova ji aka dị ike kpọpụta gị n’Ijipt.+
16 Ọ ga-abụ ihe ịrịba ama n’aka gị, bụrụkwa ihe ị ga-ekegide n’egedege ihu gị,+ n’agbata anya gị abụọ, n’ihi na Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt.”+
18 “Tinyenụ okwu m ndị a n’obi unu+ nakwa ná mkpụrụ obi unu, keekwa ha n’aka unu dị ka ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa ihe unu ga na-ekegide n’egedege ihu unu, n’agbata anya abụọ unu.+