8 Ifrem na-asịkwa, ‘N’ezie, abawo m ọgaranya;+ achọtaworo m onwe m ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+ Ma ọ dịghị oké mmehie a ga-ahụ m mere+ ná ndọgbu niile m dọgburu onwe m n’ọrụ.’
16 Ọ bụ ya mere o ji achụrụ ụgbụ ya àjà ma na-esurere ụgbụ o ji akụ azụ̀ ihe nsure ọkụ; n’ihi na ha na-eme ka òkè ya maa abụba, na-emekwa ka nri ya na-edozi ahụ́.+
7 N’ihi na ònye mere ka ị dị iche+ n’ebe onye ọzọ nọ? N’ezie, olee ihe i nwere nke a na-enyeghị gị enye?+ Ma, ọ bụrụ na e nyere gị ya enye n’ezie,+ gịnị mere i ji na-anya isi+ dị ka à ga-asị na e nyeghị gị ya enye?