46 Taa, Jehova ga-enyefe gị n’aka m,+ m ga-egbukwa gị ma bepụ gị isi; taa, m ga-ewerekwa ozu ndị agha Filistia nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa;+ ndị bi n’ụwa dum ga-amarakwa na Izrel nwere Chi.+
42 (n’ihi na ha ga-anụ banyere aha ukwu+ gị na banyere aka gị dị ike+ nakwa banyere ogwe aka gị ị gbatịrị agbatị), o wee bịa chee ihu n’ụlọ a kpee ekpere,+
15 O wee laghachikwuru onye nke ezi Chineke,+ ya na ndị niile so ya, wee bịa guzoro n’ihu ya, sị: “Lee, amatawo m ugbu a na e nweghị Chineke n’ebe ọ bụla n’ụwa ma e wezụga n’Izrel.+ Ugbu a, biko, nara ohu gị onyinye m wetara iji gọzie+ gị.”