5 Ọ ga-erukwa na mgbe ha fụrụ opi asaa ahụ e ji mpi ebule mee, mgbe unu nụrụ ụda opi ahụ, ndị agha niile ga-eji oké olu tie mkpu agha;+ mgbidi obodo ahụ ga-adaru ala,+ ndị agha ahụ ga-agbagokwa, onye ọ bụla ga-aga n’ebe o chere ihu.”
10 Jọshụa nyere ụmụ Izrel iwu,+ sị: “Unu etila mkpu, unu emekwala ka a nụ olu unu, okwu ọ bụla agaghịkwa esi n’ọnụ unu pụta ruo ụbọchị m ga-asị unu, ‘Tienụ mkpu!’ Mgbe ahụ, unu ga-eti mkpu.”+
15 Ndị ikom Juda wee malite iti mkpu agha.+ O wee ruo na mgbe ndị ikom Juda tiri mkpu agha, ezi Chineke meriri+ Jeroboam na Izrel dum n’ihu Abaịja+ na ndị Juda.