55 “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị bi n’ala ahụ n’ihu unu,+ ndị unu hapụrụ n’ime ha ga-aghọ ogwu n’anya unu, ghọọkwa ogwu n’akụkụ abụọ unu, ha ga na-awakpo unu n’ala unu ga-ebi.+
11 Mgbe ha rutewere Jibọs, ebe ọ bụ na ụbọchị agamiwo,+ onye ahụ na-eje ozi gwara nna ya ukwu, sị: “Bịa ka anyị banye n’obodo a, bụ́ obodo ndị Jibọs,+ nọrọ ka chi bọọ.”
6 Eze na ndị ikom ya wee gaa Jeruselem ibuso ndị Jibọs+ bi n’ala ahụ agha, ha wee malite ịsị Devid: “Ị gaghị abata ebe a, kama ndị ìsì na ndị ngwọrọ ga-achụghachi gị azụ,”+ n’ihi na ha chere, sị: “Devid agaghị abata ebe a.”