55 “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị bi n’ala ahụ n’ihu unu,+ ndị unu hapụrụ n’ime ha ga-aghọ ogwu n’anya unu, ghọọkwa ogwu n’akụkụ abụọ unu, ha ga na-awakpo unu n’ala unu ga-ebi.+
22 “Jehova bụ́ Chineke gị ga-ejikwa nke nta nke nta kwapụ mba ndị a n’ihu gị.+ A gaghị ekwe ka i kpochapụ ha ọsọ ọsọ, ka anụ ọhịa wee ghara ịmụba wee wakpo gị.
13 unu aghaghị ịmara na Jehova bụ́ Chineke unu agaghị anọgide na-anapụ mba ndị a ala ha n’ihi unu;+ ha ga-aghọkwara unu igbudu na ọnyà na ihe otiti n’akụkụ abụọ unu,+ ghọọkwa ogwu n’anya unu ruo mgbe unu lara n’iyi pụọ n’ezi ala a nke Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+