34 N’ikpeazụ, Jefta lọtara Mizpa,+ n’ụlọ ya, ma, lee! ada ya kụụrụ obere ịgbà, gbara egwú+ na-apụta izute ya! Ọ bụ naanị otu nwa o nwere. E wezụga ya, o nweghị ma nwa nwoke ma nwa nwaanyị.
6 O wee ruo na mgbe ha na-abata, mgbe Devid si n’igbu ndị Filistia lọta, ndị inyom malitere ịpụta n’obodo niile nke Izrel, bụrụ abụ+ ma gbara egwú gaa izute Sọl bụ́ eze, na-akụkwa obere ịgbà,+ na-aṅụrị ọṅụ,+ na-akpọkwa une.