11 Izrel nna ha wee sị ha: “Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị,+ meenụ nke a: “Tinyenụ ihe ndị kasị mma nke ala a n’akpa unu, burukwanụ ya bugara nwoke ahụ ka ọ bụrụ onyinye:+ obere mmanụ bọlsọm,+ na obere mmanụ aṅụ,+ mmanụ labdanọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó,+ akị pistashio na almọnd.+
8 M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+