54 O wee kpọọ nwa okorobịa na-eburu ya ngwá agha ngwa ngwa, sị ya: “Mịrị mma agha gị gbuo m,+ ka ha ghara ikwu banyere m, sị, ‘Ọ bụ nwaanyị gburu ya.’” Onye na-ejere ya ozi wee magbuo ya ozugbo.+
4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha:+ “Mịrị mma agha+ gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa mee m ihe na-adịghị mma.”+ Ma onye na-eburu ya ihe agha ekweghị,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha ya wee dakwasị na ya.+