10 Devid wee gaa n’ihu ịsị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ Jehova n’onwe ya ga-eme ya ihe;+ ma ọ bụkwanụ ụbọchị ya ga-eru,+ o wee nwụọ, ma ọ bụ, ọ ga-aga agha,+ e wee laa ya n’iyi.+
13 Sọl wee si otú a nwụọ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi ya nke o ji enweghị okwukwe+ meso Jehova n’ihe metụtara okwu Jehova nke ọ na-edebeghị nakwa n’ihi ịgwa onye na-agba afa+ ka ọ jụọrọ ya ase.