20 ka obi ya wee ghara ịfụli ya elu karịa ụmụnne ya+ nakwa ka ọ ghara ịhapụ ihe e nyere n’iwu gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ ka ụbọchị ọ ga-achị alaeze ya wee dị ogologo,+ ya na ụmụ ya n’etiti Izrel.
14 Ọ bụrụ na unu atụọ egwu Jehova+ ma jeere ya ozi,+ rubekwa isi n’ihe o kwuru,+ unu agharakwa inupụ isi+ n’iwu Jehova, ma unu ma eze unu nke ga-achị unu ga-abụ ndị na-eso Jehova bụ́ Chineke unu.