Diuterọnọmi 10:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 “Ugbu a, Izrel, gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị+ ma ọ́ bụghị ịtụ egwu+ Jehova bụ́ Chineke gị, ka i wee jee ije n’ụzọ ya niile+ nakwa ka ị hụ ya n’anya+ ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi;+ Job 28:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 O wee sị mmadụ,‘Lee! Ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe,+Mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya bụkwa nghọta.’”+ Abụ Ọma 111:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.+ ש [Sin]Ndị niile na-edebe iwu ya nwere ezi nghọta.+ ת [Tọọ]Otuto ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ilu 1:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma.+ Ọ bụ amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị nzuzu leghaara anya.+ Ilu 8:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị. Ilu 9:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe,+ ịmara Onye Kasị Nsọ ka nghọta bụkwa.+
12 “Ugbu a, Izrel, gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị+ ma ọ́ bụghị ịtụ egwu+ Jehova bụ́ Chineke gị, ka i wee jee ije n’ụzọ ya niile+ nakwa ka ị hụ ya n’anya+ ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi;+
28 O wee sị mmadụ,‘Lee! Ịtụ egwu Jehova—ọ bụ ya bụ amamihe,+Mmadụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya bụkwa nghọta.’”+
10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe.+ ש [Sin]Ndị niile na-edebe iwu ya nwere ezi nghọta.+ ת [Tọọ]Otuto ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị.