6 Debenụ ha, meekwanụ ha, n’ihi na nke a ga-egosi na unu nwere amamihe+ nakwa na unu nwere nghọta+ n’anya ndị ga-anụ banyere ụkpụrụ ndị a niile, ha ga-asịkwa, ‘N’ezie, mba ukwu a bụ ndị maara ihe ma nwee nghọta.’+
20 N’ihi na àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya+ ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu,+ n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke,+ ya bụ, ike ebighị ebi ya+ na ịbụ Chineke ya,+ nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ;+