11 O wee ruo na mgbe ndị niile mabu ya hụrụ ya, lee! o so ndị amụma na-ebu amụma. Ndị ahụ wee gwa ibe ha, sị: “Gịnị bụ ihe a na-eme nwa Kish? Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+
24 Ya onwe ya kwa yipụrụ uwe ya ma na-eme dị ka onye amụma n’ihu Samuel, ee, ya onwe ya, ọ gbakwa ọtọ dinara ala n’ehihie ahụ dum nakwa n’abalị ahụ dum.+ Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+