1 Samuel 15:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Samuel wee sị ya: “Jehova adọkapụwo+ ọchịchị Izrel n’aka gị taa, ọ ga-enyekwa ya mmadụ ibe gị bụ́ onye ka gị mma.+ 1 Samuel 24:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Lee! M maara nke ọma na ị ga-abụrịrị eze,+ na ọ bụkwa n’aka gị ka alaeze Izrel ga-adịgide. 1 Samuel 26:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Sọl wee sị Devid: “Bụrụ onye a gọziri agọzi, nwa m Devid. Ọ bụghị naanị na ị ga-akpa ike, kama ị ga-abụkwa onye mmeri.”+ Devid wee pụwa; ma Sọl laghachiri n’ụlọ ya.+ Job 17:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Onye ezi omume na-anọgidesi ike n’ụzọ ya,+Onye aka ya dị ọcha+ na-enwewanyekwa ume.+
28 Samuel wee sị ya: “Jehova adọkapụwo+ ọchịchị Izrel n’aka gị taa, ọ ga-enyekwa ya mmadụ ibe gị bụ́ onye ka gị mma.+
25 Sọl wee sị Devid: “Bụrụ onye a gọziri agọzi, nwa m Devid. Ọ bụghị naanị na ị ga-akpa ike, kama ị ga-abụkwa onye mmeri.”+ Devid wee pụwa; ma Sọl laghachiri n’ụlọ ya.+