14 Ugbu a, alaeze gị agaghị adịte aka.+ Jehova ga-achọtara onwe ya nwoke obi ya nabatara;+ Jehova ga-ahọpụtakwa ya ịbụ onye ndú+ nke ndị ya, n’ihi na i debeghị ihe Jehova nyere gị n’iwu.”+
8 Sọl wee malite iwe oké iwe,+ okwu a jọkwara njọ n’anya ya, o wee sị: “Ha enyewo Devid iri puku kwuru iri puku, ma nye m puku kwuru puku, naanị ihe fọdụrụ inye ya bụ ọchịchị!”+
31 N’ihi na ruo ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ n’elu ala, gị na ọbụbụeze gị agaghị eguzosi ike.+ N’ihi ya, zie ozi kpọtara m ya, n’ihi na ọ ga-anwụrịrị.”+
17 O wee sị ya: “Egwu atụla gị;+ n’ihi na aka Sọl nna m agaghị enweta gị, gị onwe gị ga-abụ eze+ Izrel, mụ onwe m ga-abụkwa osote gị; Sọl nna m makwaara nke ahụ.”+