31 E wee kọọrọ Devid, sị: “Ahitofel so ná ndị ha na Absalọm+ na-agba izu ọjọọ.”+ Devid wee sị:+ “Biko, Jehova,+ mee ka ndụmọdụ Ahitofel ghọọ ihe nzuzu!”+
23 Ndụmọdụ Ahitofel, bụ́ ndị o nyere n’ụbọchị ndị ahụ, na-adị nnọọ ka mgbe mmadụ jụtara ihe ezi Chineke kwuru. Ọ bụ otú ahụ ka ndụmọdụ+ Ahitofel+ na-adị Devid na Absalọm.
23 Ma Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ dụrụ n’ọdụ,+ o wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu wee bilie laa n’ụlọ ya, n’obodo ya.+ O wee nye ezinụlọ ya iwu+ ma kwụgbuo+ onwe ya, o wee si otú a nwụọ.+ E wee lie+ ya n’ebe ili ozu nke nna nna ya hà.