21 Ọ bụkwa n’ihu Elieza onye nchụàjà ka ọ ga na-eguzo, ọ ga na-ajụtara ya ase+ n’ihu Jehova site ná mkpebi ikpe nke Yurim.+ Ọ bụ ya ga na-agwa ha mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ụmụ Izrel niile na nzukọ ahụ dum.”
2O wee ruo, mgbe e mesịrị, na Devid jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo n’otu n’ime obodo ndị dị na Juda?” Jehova wee sị ya: “Gbagoo.” Devid wee sị: “Olee ebe m ga-agbago?” O wee sị: “Hibrọn.”+