Ndị Ikpe 1:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 1 O wee ruo na mgbe Jọshụa nwụsịrị,+ ụmụ Izrel jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebu ụzọ gaa buso ndị Kenan agha?” 1 Samuel 28:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ọ bụ ezie na Sọl na-ajụ Jehova ase,+ Jehova anaghị aza ya ma ọlị,+ ma ọ̀ bụ ná nrọ+ ma ọ̀ bụ site na Yurim+ ma ọ̀ bụ site n’ọnụ ndị amụma.+ 1 Samuel 30:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Devid wee malite ịjụ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a? M̀ ga-achụkwu ha?” O wee zaa ya,+ sị: “Chụwa ha, n’ihi na ị ga-achụkwu ha, ị ga-anapụtakwa ha ihe niile.”+ 2 Samuel 5:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Devid wee jụọ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo buso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova wee sị Devid: “Gbagoo, n’ihi na m ga-enyeferịrị ndị Filistia n’aka gị.”+ Abụ Ọma 37:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova,+Dabere n’ebe ọ nọ,+ ya onwe ya ga-emekwa ihe.+ Ilu 3:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi,+ adaberekwala ná nghọta gị.+
1 O wee ruo na mgbe Jọshụa nwụsịrị,+ ụmụ Izrel jụrụ Jehova ase,+ sị: “Ònye n’ime anyị ga-ebu ụzọ gaa buso ndị Kenan agha?”
6 Ọ bụ ezie na Sọl na-ajụ Jehova ase,+ Jehova anaghị aza ya ma ọlị,+ ma ọ̀ bụ ná nrọ+ ma ọ̀ bụ site na Yurim+ ma ọ̀ bụ site n’ọnụ ndị amụma.+
8 Devid wee malite ịjụ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a? M̀ ga-achụkwu ha?” O wee zaa ya,+ sị: “Chụwa ha, n’ihi na ị ga-achụkwu ha, ị ga-anapụtakwa ha ihe niile.”+
19 Devid wee jụọ Jehova ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo buso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova wee sị Devid: “Gbagoo, n’ihi na m ga-enyeferịrị ndị Filistia n’aka gị.”+