1 Ihe E Mere
14 Haịram+ eze Taya+ wee zigara Devid ndị ozi, zigakwara ya osisi sida+ na ndị na-ewu mgbidi na ndị ọkwá nkà ka ha wuoro ya ụlọ.+ 2 Devid wee mara na Jehova emewo ka o guzosie ike+ dị ka eze Izrel, n’ihi na e buliri alaeze ya elu nke ukwuu n’ihi ndị ya bụ́ Izrel.+
3 Devid wee lụkwuo ụmụ nwaanyị+ na Jeruselem. Devid wee mụtakwuo ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+ 4 Ndị a bụ aha ụmụ ọ mụrụ na Jeruselem: Shamua+ na Shobab,+ Netan+ na Sọlọmọn,+ 5 na Ịbha+ na Elaịshua na Elpelet,+ 6 na Noga na Nifeg+ na Jefaya, 7 na Elishama+ na Beelayada na Elifelet.+
8 Ndị Filistia wee nụ na e tewo Devid mmanụ ịbụ eze Izrel dum.+ Ndị Filistia niile wee gbagote ịchọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara ka o buso ha agha. 9 Ma ndị Filistia batara wee na-awakpo ndagwurugwu Refeyim.+ 10 Devid wee jụọ Chineke ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo buso ndị Filistia agha, ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova wee sị ya: “Gbagoo, m ga-enyefe ha n’aka gị.” 11 Devid wee gbagoo Bel-perezim,+ o wee merie ha n’ebe ahụ. Devid wee sị: “Ezi Chineke esiwo n’aka m kwada ndị iro m dị ka ebe mmiri kwadara.” Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ+ Bel-perezim. 12 Ha wee hapụ chi ha dị iche iche n’ebe ahụ.+ Devid wee nye iwu, e wee gbaa ha ọkụ.+
13 Mgbe e mesịrị, ndị Filistia wakporo ndagwurugwu ahụ ọzọ.+ 14 Devid wee jụọ+ Chineke ase ọzọ, ezi Chineke wee sị ya: “Achụrụla ha gbagoo. Gaa nkọnkọ nkọnkọ ka i wee ghara ibuso ha agha ihu na ihu, ị ga-ezutekwa ha n’ihu ebe ahụ osisi beka jupụtara.+ 15 Ọ ga-erukwa na mgbe ị nụrụ ụda ụkwụ n’elu osisi beka ndị ahụ,+ ị ga-apụ gaa buo agha,+ n’ihi na ezi Chineke ga-agaworị n’ihu gị+ igbu ndị agha ndị Filistia.” 16 Devid wee mee dị nnọọ ka ezi Chineke nyere ya n’iwu,+ ha wee gbuo ndị agha ndị Filistia malite na Gibiọn+ ruo Giza.+ 17 Devid wee malite ide ude+ n’ala niile, Jehova wee mee ka ụjọ ya jide mba niile.+