8 Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.
9 Ka Jehova bụ́ Chineke gị bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye nwere mmasị+ n’ebe ị nọ site n’ime ka ị nọkwasị n’ocheeze Izrel;+ n’ihi na Jehova hụrụ Izrel n’anya ruo mgbe a na-akaghị aka,+ nke mere na ọ họpụtara gị ịbụ eze+ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi+ ma na-eme ezi omume.”+