11 Devid wee gbagoo Bel-perezim,+ o wee merie ha n’ebe ahụ. Devid wee sị: “Ezi Chineke esiwo n’aka m kwada ndị iro m dị ka ebe mmiri kwadara.” Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ+ Bel-perezim.
21 N’ihi na Jehova ga-ebili dị ka o biliri n’Ugwu Perezim,+ ọ ga-ewe iwe dị ka o were na ndagwurugwu nke dị nso na Gibiọn,+ ka o wee mee ihe ọ na-eme, ihe ọ na-eme dị ịtụnanya, ka o wee rụọ ọrụ ya, ọrụ ya na-eju anya.+