24 Ka aha gị+ bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi, ka ọ dịkwa ukwuu+ ruo mgbe ebighị ebi, ka ndị mmadụ wee sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ Chineke Izrel,+ bụụrụ Izrel Chineke,’+ ka ụlọ ohu gị Devid bụrụ nke ga-adịgide n’ihu gị.+
11 Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu+ na ike+ na ịma mma+ na ebube+ na nsọpụrụ;+ n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile,+ ọ bụ gị nwe alaeze.+