24 Devid wee malite ịkasi Bat-shiba nwunye ya obi.+ Ọzọ, ọ bakwuuru ya, ya na ya wee dinaa. Ka oge na-aga, ọ mụrụ nwa nwoke,+ e wee gụọ ya Sọlọmọn.+ Jehova hụkwara ya n’anya.+
11 Netan+ wee gwa Bat-shiba,+ nne Sọlọmọn,+ sị: “Ọ̀ bụ na ị nụbeghị na Adọnaịja nwa Hagit+ aghọwo eze, ma onyenwe anyị bụ́ Devid amaghị banyere ya ma ọlị?