27 Mgbe Abna lọghachitere na Hibrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha wee banye n’ọnụ ụzọ ámá ka ọ gwa ya okwu na nzuzo.+ Otú ọ dị, ọ mara ya mma n’afọ n’ebe ahụ,+ o wee nwụọ n’ihi ọbara Asahel+ nwanne ya.
6 Ma, lee, ha batara n’etiti ụlọ ahụ dị ka à ga-asị na ha bịara ikporo ọka wit, wee maa ya mma n’afọ;+ Rikab na Beana+ nwanne ya nwoke wee gbapụ n’enweghị onye hụrụ ha.
10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka; o wee were ya maa+ ya n’afọ, eriri afọ ya wee wụpụtasịa n’ala, ya ahapụzie ịma ya ọzọ. O wee nwụọ. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke wee chụrụ Shiba nwa Bikraị gawa.