23 Ma ọ jụrụ ịkwụsị; Abna wee maa ya isi ube n’afọ,+ ube ahụ wee si ya n’azụ pụta; o wee daa nwụọ n’ebe ahụ. O wee ruo na ndị niile bịarutere n’ebe ahụ Asahel dara nwụọ na-akwụsị guzoro.+
27 Mgbe Abna lọghachitere na Hibrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha wee banye n’ọnụ ụzọ ámá ka ọ gwa ya okwu na nzuzo.+ Otú ọ dị, ọ mara ya mma n’afọ n’ebe ahụ,+ o wee nwụọ n’ihi ọbara Asahel+ nwanne ya.
10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka; o wee were ya maa+ ya n’afọ, eriri afọ ya wee wụpụtasịa n’ala, ya ahapụzie ịma ya ọzọ. O wee nwụọ. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke wee chụrụ Shiba nwa Bikraị gawa.