17 Unu elela mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe.+ Unu ga-anụrụ ihe onye nta ga-ekwu dịkwa ka unu ga-anụrụ nke onye ukwu.+ Unu atụla ụjọ n’ihi mmadụ,+ n’ihi na ikpe bụ nke Chineke;+ okwu ikpe nke siiri unu oké ike, unu ga-eweta ya n’ihu m, m ga-anụrụkwa ya.’+